Categories
Igbo

Liverpool F.C: 2020 ọ ga-abụ afọ ha ga-emecha metụ iko Premier League aka?

Ọ dị ka afọ 2020 a ga-abụ afọ Liverpool ga-emechi ndị na-akọ ha ọnụ maka ebuteghi iko Premier League.

Ọ bụrụ na a mụrụ gị n’ihe dị ka site n’afọ 1989/90 ruo ugbua, mara na gị na mgbe ikpeazụ Liverpool metụrụ iko Premier League aka, bụ ọgbọ.

Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na ikpeazụ otu egwuregwu a buliri iko a, bụ afọ iri atọ gara aga (1989/90).

Ka a kwụ ugbua na tebulu Premier League, Liverpool chị ezigbo ọkụ bịa n’afọ 2019/2020 a, makana ha emeriela egwuregwu 19 n’ime 20 ha gbarala.

Ebe ọ fọrọ egwuregwu 18 tupu afọ a emechie, ha mere etu a na-aga n’ihu, enweghị ihe ga-egbochi aka ha ibuli iko a.

Ha enwetala pọịntị 58, ebe ndị na-eso ha n’azụ bụ Leicester City nwere pọịntị 45; nke bụ na ọ bụ pọịntị 13 ka Liverpool ji aga ha.

Ọ bụ ọgwụ ka e mere ha ya eme?

Ọ bụrụ n’ajụjụ a na-anụ gị ọkụ n’obi, i fughi ụzọ, n’ihi na ọ bụkwa ajụjụ ọtụtụ mmadụ na-ajụ gbasara ihe mere na Liverpool ebutebeghi iko a.

Mana ọ bụ na ha erubeghi nso imetụ ya aka? Ha agbalịala ibute ya bụ iko, mana iko ahụ na-eme ha ọnọ nso eru aka.

Liverpool

Ugboro ole ha ruru nso ibute iko Premier League

Ugboro ugboro ka Liverpool ruru nso imetụ iko a aka, nke kacha nso abụrụ n’afọ 2018/2019 mgbe Manchester City ji naanị otu pọịntị gafee ma pụchara iko ahụ n’ụbọchị ikpeazụ a pịachiri asọmpi Premier League nke afọ ahụ.

Ha ruru nso imetụ iko a aka n’afọ 2013/2014, mgbe Manchester City napụkwara ha nri n’ọnụ.

N’afọ 2001/2002, ha ruru nso ibute iko a, mana Arsenal buliri ya bụ iko ebe Liverpool gbara ndị nke abụọ.

Otu ihe ahụ mekwara n’afọ 2008/2009, mgbe Manchester United ji naanị pọịntị anọ gafee ha ma bulie iko.

N’afọ 1990/1991 ka ha rukwara nso ọzọ ka ha mabutechara ya bụ iko n’afọ 1989/90, mana Arsenal bụ ndị bu Iko ahụ laa.

Liverpool
Nkenke aha onyonyoLiverpool buliri iko Champions League ọzọ n’afọ 2018/2019

Iko ole ha buterela n’ime afọ 30 a:

Na ha ebutebeghi iko abụghịkwanụ na ha gba aka iko n’ime afọ iri atọ a (site n’afọ 1990 ruo 2019).

Lee ndị ha butenwuru:

  • Iko Champions League – Abụọ. Ha butere n’afọ 2004/05 na 2018/19
  • Iko FA – Atọ. Ha butere n’afọ 1991/92, 2000/01 na 2005/06
  • Community Shield – Atọ. N’afọ 1990, 2001 na 2006
  • Iko UEFA Europa League – Otu. N’afọ 2000/01
  • Iko UEFA Super Cup – Atọ. N’afọ 2001, 2005 na 2019
  • Iko FIFA nke klọb ndị meriri na mbaụwa – Otu. N’afọ 2019
  • Iko EFL/Carabao – Anọ. N’afọ 1994/95, 2000/01, 2002/03 na 2011/12

-BBC

Facebook Comments

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *